Jọn 12

Aịzaya kwuru ihe ndị a nʼihi na ọ hụrụ ebube ya, ma kwuo banyere ya.

John 12:41 (UKJV) These things said Isaiah, when he saw his glory, and spoke of him.

39Ma ha enweghị ike kwere, nʼihi na Aịzaya kwukwara nʼebe ọzọ, sị,

40“O meela ka ha kpuo ìsì, mekwa ka obi ha kpọchie Ka ha ghara iji anya ha hụ ụzọ maọbụ jiri obi ha ghọta ihe ọbụla Ka ha gharakwa ichigharị, ka m gwọọ ha.”

41Aịzaya kwuru ihe ndị a nʼihi na ọ hụrụ ebube ya, ma kwuo banyere ya.

42Otu ọ dị, ọtụtụ nʼime ndịisi kweere na ya, ma ha ekwupụtaghị nke a. Nʼihi na ha tụrụ egwu na ndị Farisii ga-achụpụ ha site nʼụlọ ekpere.

43Nʼihi na ha hụrụ otuto mmadụ nʼanya karịa otuto Chineke.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.