6O kwughị nke a nʼihi na ihe banyere ndị ogbenye na-emetụ ya nʼobi kama nʼihi na ọ bụ onye ohi; dị ka onye na-ejide akpa ego ha, mgbe ụfọdụ, ọ na-amanye aka nʼego ahụ zubiri ego.
7Jisọs sịrị, “Hapụ ya aka, ọ zụtara ya ka ọ na-akwado maka ụbọchị olili m.
8Unu nwere ndị ogbenye nʼetiti unu mgbe niile, ma mụ na unu agaghị anọ mgbe niile.”
9Ma mgbe igwe ndị Juu nụrụ na ọ nọ nʼebe ahụ, ha bịara, ọ bụghị naanị ka ha hụ ya, kama ka ha hụkwa Lazarọs onye o mere ka o si na ndị nwuru anwụ bilie.
10Ya mere, ndịisi nchụaja gbakwara izu igbukwa Lazarọs.