18Agaghị m ahapụ unu dị ka ndị na-enweghị nne na nna. Aga m abịakwute unu.
19Mgbe na-adịghị anya, ụwa agaghị ahụkwa m anya. Ma unu ga-ahụ m anya. Nʼihi na m dị ndụ, unu ga-adịkwa ndụ.
20Nʼụbọchị ahụ, unu ga-amata na m nọ nʼime Nna m na unu nọ nʼime m, na mụ onwe m nọkwa nʼime unu.
21Onye ọbụla nabatara iwu m ma na-edebekwa ha bụ onye hụrụ m nʼanya. Onye hụrụ m nʼanya ka Nna m ga-ahụ nʼanya. Aga m ahụkwa ya nʼanya gosikwa ya onwe m.”
22Judas (ọ bụghị Iskarịọt) sịrị ya, “Onyenwe anyị, olee otu ị ga-esi gosi anyị onwe gị ma hapụ igosi ụwa onwe gị?”