Jọn 14

Onye na-ahụghị m nʼanya agaghị edebe okwu m. Okwu ndị a niile unu nụrụ abụghị nke m. Ha bụ nke Nna ahụ, onye zitere m.

John 14:24 (UKJV) He that loves me not keeps not my sayings: and the word which all of you hear is not mine, but the Father's which sent me.

22Judas (ọ bụghị Iskarịọt) sịrị ya, “Onyenwe anyị, olee otu ị ga-esi gosi anyị onwe gị ma hapụ igosi ụwa onwe gị?”

23Jisọs zara sị ya, “Onye ọbụla hụrụ m nʼanya, ga-edebe okwu m. Nna m ga-ahụkwa ya nʼanya. Mụ na Nna m ga-abịakwa nʼebe onye ahụ nọ soro ya biri.

24Onye na-ahụghị m nʼanya agaghị edebe okwu m. Okwu ndị a niile unu nụrụ abụghị nke m. Ha bụ nke Nna ahụ, onye zitere m.

25“Agwala m unu ihe ndị a niile ugbu a mụ na unu nọ.

26Ma Onye Nkasiobi ahụ bụ Mmụọ Nsọ, onye Nna m ga-ezite nʼaha m, ga-akụziri unu ihe niile, ọ ga-echetakwara unu ihe niile m gwara unu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.