25“Agwala m unu ihe ndị a niile ugbu a mụ na unu nọ.
26Ma Onye Nkasiobi ahụ bụ Mmụọ Nsọ, onye Nna m ga-ezite nʼaha m, ga-akụziri unu ihe niile, ọ ga-echetakwara unu ihe niile m gwara unu.
27Udo ka m na-ahapụrụ unu. Udo m ka m na-enyekwa unu. Ọ bụghị dị ka ụwa si enye ka m na-enye unu. Unu ekwela ka obi lọọ unu mmiri, ka ụjọ hapụkwa ịtụ unu.
28“Unu anụla na m gwara unu, ‘Ana m ala, ma lọghachikwutekwa unu.’ Ọ bụrụ na unu hụrụ m nʼanya, unu gaara aṅụrị ọṅụ na m na-alakwuru Nna, nʼihi na Nna dị ukwuu karịa m.
29Ugbu a, agwala m unu ihe a tupu o mezuo, ka ọ ga-abụ mgbe o mezuru, unu enwee ike kwere.