Jọn 14

Unu maara ụzọ ebe m na-aga.”

John 14:4 (UKJV) And where I go all of you know, and the way all of you know.

2Nʼụlọ Nna m, e nwere ọtụtụ ebe obibi. Ọ bụrụ na o sighị otu a dịrị, agaara m agwa unu na m na-aga kwadoro unu ebe obibi?

3Ọ bụrụ na m agaa dozichara unu ebe obibi, aga m alọghachi bịa kpọrọ unu, ka ebe m nọ bụrụkwa ebe unu ga-anọ.

4Unu maara ụzọ ebe m na-aga.”

5Tọmọs sịrị ya, “Onyenwe anyị, anyị amaghị ebe ị na-aga, olee otu anyị ga-esi mata ụzọ ya?”

6Jisọs sịrị ya, “Mụ onwe m bụ ụzọ, na eziokwu, na ndụ. O nweghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ bụghị site na m.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.