Jọn 14

Filip sịrị ya, “Onyenwe anyị, zi anyị Nna ahụ, afọ ga-ejukwa anyị.”

John 14:8 (UKJV) Philip says unto him, Lord, show us the Father, and it satisfies us.

6Jisọs sịrị ya, “Mụ onwe m bụ ụzọ, na eziokwu, na ndụ. O nweghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ bụghị site na m.

7Ọ bụrụ na unu maara onye m bụ, unu gaara amatakwa Nna m. Site ugbu a, unu amatala ya. Ma hụkwa ya.”

8Filip sịrị ya, “Onyenwe anyị, zi anyị Nna ahụ, afọ ga-ejukwa anyị.”

9Jisọs sịrị ya, “Ọtụtụ oge ndị a mụ na unu nọrọ ọ bụ na ị matabeghị onye m bụ, Filip? Onye ọbụla hụrụ m ahụla Nna. Olee otu i si asị, ‘zi anyị Nna ahụ?’

10Ọ bụ na i kweghị na m nọ nʼime Nna, na Nna nọkwa nʼime m? Okwu niile m na-agwa unu esitekwaghị nʼebe m nọ pụta, kama ọ bụ Nna bi nʼime m na-arụ ọrụ ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.