17Ihe ndị a ka m na-enye unu nʼiwu, hụrịtanụ onwe unu nʼanya.
18“Ọ bụrụ na ụwa akpọọ unu asị, chetanụ na o buru ụzọ kpọọ m asị.
19A sị na unu bụ nke ụwa, ụwa ga-ahụ unu nʼanya dịka ndị nke ya. Ma otu ọ dị unu abụghị nke ụwa. Kama, esi m nʼime ụwa họrọ unu. Ọ bụkwa nʼihi ya ka ụwa ji akpọ unu asị.
20Chetakwanụ ihe m gwara unu, ‘Ohu adịghị adị ukwuu karịa Onyenwe ya.’ Ya mere, ebe ha kpagburu m, ha ga-akpagbukwa unu. Ọ bụrụ na ha debere okwu m, ha ga-edebekwa nke unu.
21Ee, ha ga-eme unu ihe niile ndị a nʼihi aha m, na nʼihi na ha amaghị onye ahụ zitere m.