Jọn 15

Nọgidenụ nʼime m, ka mụ onwe m nọgidekwa nʼime unu. Dịka alaka ọbụla apụghị ịmị mkpụrụ nʼonwe ya ma ọ bụrụ na ọ nọgideghị nʼosisi vaịnị. Otu a, unu apụghịkwa ịmị mkpụrụ ma ọ bụrụ na unu anọgideghị nʼime m.

John 15:4 (UKJV) Abide in me, and I in you. As the branch cannot bear fruit of itself, except it abide in the vine; no more can all of you, except all of you abide in me.

2Ọ na-egbuda alaka ọbụla dị nʼime m nke na-adịghị amị mkpụrụ. Ma alaka ọbụla na-amị mkpụrụ ka ọ na-egbucha, ka o nwee ike mịa mkpụrụ dị ọtụtụ.

3Ugbu a, e meela ka unu dịrị ọcha nʼihi okwu m gwara unu.

4Nọgidenụ nʼime m, ka mụ onwe m nọgidekwa nʼime unu. Dịka alaka ọbụla apụghị ịmị mkpụrụ nʼonwe ya ma ọ bụrụ na ọ nọgideghị nʼosisi vaịnị. Otu a, unu apụghịkwa ịmị mkpụrụ ma ọ bụrụ na unu anọgideghị nʼime m.

5“Mụ onwe m bụ osisi vaịnị ahụ; unu bụkwa alaka ya. Onye ọbụla na-anọgide nʼime m, nke mụ onwe m na-anọgidekwa nʼime ya, na-amị ọtụtụ mkpụrụ. Nʼihi na ewezuga m, unu enweghị ike ime ihe ọbụla.

6Onye ọbụla na-adịghị anọgide nʼime m dị ka alaka e gbuturu, tụpụ ya, ọ kpọnwụọ. A ga-achịkọta ya, chịnye ya nʼọkụ, o repịa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.