7Ọ bụrụ na unu anọgide nʼime m, okwu m anọgidekwa nʼime unu, rịọọnụ ihe ọbụla unu chọrọ, a ga-emere unu ya.
8Nke a ga-abụrụ Nna m otuto na unu mịrị ọtụtụ mkpụrụ hie nne, ọ na-egosikwa na unu bụ ndị na-eso ụzọ m.
9“Dị ka Nna sị hụ m nʼanya, otu a ka m sị hụkwa unu nʼanya. Ya mere, nọgidenụ nʼime ịhụnanya m.
10Unu ga-anọgide nʼịhụnanya m ma ọ bụrụ na unu edebe iwu m. Dị ka m debere iwu Nna m ma nọgidekwa nʼịhụnanya ya.
11Agwala m unu ihe ndị a ka ọṅụ m dịrị nʼime unu ka ọṅụ unu zukwaa oke.