13Ha buru ụzọ duru ya jekwuru Anas, onye bụ nna nwunye Kaịfas. Onye bụ onyeisi nchụaja nʼafọ ahụ.
14Kaịfas bụkwa onye ahụ dụrụ ndị ndu ndị Juu ọdụ, sị na ọ ka mma ka otu onye nwụọ nʼihi mmadụ niile.
15Saimọn Pita na otu onye ọzọ na-eso ụzọ ya sooro Jisọs. Nʼihi na onye nke ahụ na-eso ụzọ ya bụ onye onyeisi nchụaja maara nke ọma, o sooro Jisọs banye nʼobi onyeisi nchụaja.
16Ma Pita na-eguzo nʼezi nʼọnụ ụzọ. Onye ọzọ ahụ na-eso ụzọ ya, nke onyeisi nchụaja maara nke ọma, pụrụ nʼezi gwa nwaagbọghọ ahụ na-eche ọnụ ụzọ okwu, ma kpọbata Pita.
17Nwaagbọghọ ahụ sịrị Pita, “Ọ bụ na ị bụghị otu nʼime ndị na-eso ụzọ nwoke a?” Pita sịrị, “Mba! Abụghị m.”