21Gịnị mere i ji ajụ m? Jụọ ndị niile gere m ntị! Ha makwaara ihe niile m kwuru.”
22Mgbe o kwuru nke a, otu onye nʼime ndị na-eje ozi guzo nʼakụkụ ya, mara Jisọs ụra nʼihu, sị, “Ọ bụ otu a ka ị si aza onyeisi nchụaja ajụjụ?”
23Jisọs zara ya, “Ọ bụrụ na ọ dị ihe ọjọọ m kwuru, gbaa ama megide okwu ọjọọ dị otu a, ma ọ bụrụ na m kwuru eziokwu, gịnị mere i ji ama m ụra.”
24Ya mere, Anas kere ya agbụ zigara ya Kaịfas onyeisi nchụaja.
25Ma dịka Saimọn Pita ka guzo nʼebe ahụ na-anya ọkụ, ha sịrị ya, “Ọ bụ na ị bụghị otu onye nʼime ndị na-eso ụzọ ya?” Ma ọ gọrọ agọ sị, “Abụghị m ya.”