37Pailet sịrị ya, “Ya bụ na ị bụ eze?” Jisọs zara, “Gị onwe gị kwuru na m bụ eze. Amụrụ m nʼihi nke a, ọ bụkwa nʼihi nke a ka m ji bi a nʼụwa ịgba ama banyere eziokwu. Onye ọbụla hụrụ eziokwu nʼanya na-ege m ntị.”
38Pailet sịrị ya, “Gịnị bụ eziokwu?” Mgbe o kwuchara nke a, ọ pụrụ jekwuuru ndị Juu ọzọ sị ha, “Ọ dịghị ihe ọbụla m chọpụtara megidere ya.
39Ma ọ bụ omenaala unu, na m ga-ahapụrụ unu otu onye mkpọrọ nʼoge Mmemme Ngabiga. Unu chọrọ ka m hapụrụ unu ‘eze ndị Juu’?”
40Ha tiri mkpu ọzọ sị, “Ọ bụghị nwoke a, ma hapụrụ anyị Barabas.” Barabas bụ onye abalị dị egwu.