6Ngwangwa, ndịisi nchụaja na ndị nche hụrụ ya, ha tiri mkpu sị, “Kpọgide ya nʼobe! Kpọgide ya nʼobe!” Pailet sịrị ha, “Kpọrọnụ ya kpọgbuo ya nʼonwe unu. Achọpụtaghị m ihe ọjọọ ọbụla o mere.”
7Ndị Juu zara ya, “Anyị nwere iwu, dị ka iwu ahụ siri dị, ihe kwesiri ya bụ ọnwụ, nʼihi na ọ kpọrọ onwe ya Ọkpara Chineke.”
8Mgbe Pailet nụrụ nke a, oke egwu tụrụ ya karịa.
9Ọ laghachiri azụ nʼime ụlọeze ahụ, jụọ Jisọs, “Olee ebe i siri bịa?” Ma Jisọs azaghị ya ihe ọbụla.
10Pailet sịrị ya, “Ị na-agba m nkịtị? Ọ bụ na ị maghị na m nwere ike ịkpọgide gị nʼobe, nweekwa ike ịhapụ gị ka ị laa?”