9Mgbe ahụ onyeisi oche ahụ detụrụ mmiri ahụ e mere ka ọ ghọọ mmanya ọnụ. Ọ mataghị ebe o siri pụta (ma ndị na-eje ozi, ndị kutere mmiri ahụ matara), onyeisi oche ahụ kpọpụtara onye ahụ na-alụ nwunye ọhụrụ iche
10sị ya, “Nʼoge mmemme ọbụla, a na-ebu ụzọ buputa mmanya dị ụtọ, ma bupụtakwa nke na-adịghị ụtọ nʼikpeazụ, mgbe ndị mmadụ ṅụjuchara afọ, ma i chebere mmanya dị ụtọ buputa ya ugbu a.”
11Nke a bụ mmalite ihe ama Jisọs mere na Kena nke Galili, o sitere na nke a kpughee ebube ya, ndị na-eso ụzọ ya kwenyekwara na ya.
12Mgbe nke a gasịrị, ọ gara Kapanọm, ya na nne ya na ụmụnne ya, nakwa ndị na-eso ụzọ ya. Ha nọrọ ụbọchị ole na ole nʼebe ahụ.
13Mgbe mmemme oriri Ngabiga nke ndị Juu na-abịaru nso, Jisọs gara Jerusalem.