19Jisọs zara sị, “Kwatuonụ ụlọnsọ ukwu a, aga m ewughachikwa ya nʼabalị atọ.”
20Ndị Juu kwuru, “Ụlọnsọ ukwu a were anyị iri afọ anọ na isii ịrụ ya, ị ga-ewughachi ya nʼabalị atọ?”
21Ma ụlọnsọ o kwuru maka ya bụ ahụ ya.
22Ndị na-eso ụzọ ya chetara okwu ya a mgbe o siri nʼọnwụ bilie. Mgbe ahụkwa, ha kweere akwụkwọ nsọ ya na okwu niile Jisọs kwuru.
23Mgbe ọ nọ na Jerusalem nʼoge Mmemme Ngabiga, ọtụtụ mmadụ hụrụ ihe ịrịbama o mere kweere na ya.