Jọn 20

Mgbe abalị asatọ gasịrị, ndị na-eso ụzọ ya zukọtara ọzọ. Ugbu a Tọmọs nọkwa nʼetiti ha. Nʼagbanyeghị na e mechisịrị ụzọ niile, Jisọs batara guzo nʼetiti ha sị ha, “Udo dịrị unu.”

John 20:26 (UKJV) And after eight days again his disciples were within, and Thomas with them: then came Jesus, the doors being shut, and stood in the midst, and said, Peace be unto you.

24Ma Tọmọs (onye a na-akpọ Didimọs), otu nʼime ndị ozi iri na abụọ ahụ, anọghị ya mgbe Jisọs bịara.

25Ya mere, ndị ọzọ na-eso ụzọ ya gwara ya, “Anyị ahụla Onyenwe anyị!” Ma ọ sịrị ha, “Ọ bụ naanị mgbe m jiri anya m hụ ebe ahụ ntu kpọpuru ya aka, tinye mkpịsịaka m nʼapa ntu ndị ahụ, ma tinyekwa aka m nʼakụkụ ya ebe ahụ a mara ya ùbe, ka m ga-ekwere.”

26Mgbe abalị asatọ gasịrị, ndị na-eso ụzọ ya zukọtara ọzọ. Ugbu a Tọmọs nọkwa nʼetiti ha. Nʼagbanyeghị na e mechisịrị ụzọ niile, Jisọs batara guzo nʼetiti ha sị ha, “Udo dịrị unu.”

27Mgbe ahụ ọ sịrị Tọmọs, “Rụnye mkpịsịaka gị nʼebe a, leekwa aka m abụọ. Wepụta aka gị tinyekwa nʼakụkụ m. Abụla onye na-enweghị okwukwe, kama kwere.”

28Tọmọs zara sị ya, “Onyenwe m na Chineke m!”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.