3Ya mere Pita na onye nke ọzọ ahụ na-eso ụzọ ya pụrụ gawa nʼili ahụ.
4Ha abụọ jiri ọsọ na-aga, ma onye ọzọ ahụ na-eso ụzọ ya gbakarịrị Pita nʼọsọ buru ya ụzọ ruo nʼili ahụ.
5O hulatara ala, nyoo anya nʼime ili, hụ akwa ọcha ahụ ebe ha wụsara nʼala, ma ọ baghị nʼime.
6Ya mere Saimọn Pita, onye na-eso ya nʼazụ bịarutere banye nʼime ili ahụ. Ọ hụrụ akwa ozu ahụ ka ọ wụsara nʼala,
7ya na akwa nke e ji kechie ya isi. Ịchafọ a na akwa ọcha ahụ adịkọtaghị nʼotu ebe, kama a pịara ya apịa dobe ya iche nʼebe ọzọ.