17Nʼihi na Chineke eziteghị Ọkpara ya nʼụwa ka o maa ụwa ikpe, kama ka e site nʼaka ya zọpụta ụwa.
18Ikpe amaghị onye ọbụla kwere na ya, ma onye ọbụla na-ekweghị aghọọlarị onye ikpe mara, nʼihi na o kweghị nʼaha Ọkpara Chineke mụrụ naanị ya.
19Nke a bụ mkpebi ikpe ahụ; na Ìhè abịala nʼụwa, ma ụmụ mmadụ hụrụ ọchịchịrị nʼanya kama ìhè ahụ, nʼihi na ọrụ ha jọrọ njọ.
20Nʼihi na onye ọbụla na-eme ihe ọjọọ kpọrọ ìhè ahụ asị, ọ dịghị abịakwute ìhè ahụ, ka a ghara ime ka ọrụ ya pụta ìhè.
21Ma ndị na-ebi ndụ nʼeziokwu na-abịakwute ìhè ahụ, ka e nwee ike hụta ya nke ọma, na ihe niile ha na-eme sitere na ike Chineke.