28Unu onwe unu ga-agbara m akaebe na m sịrị, na abụghị m Kraịst ahụ, kama e zitere m ka m buru ụzọ bịa.
29Nwanyị a na-alụ ọhụrụ bụ nke di ya. Enyi onye na-alụ nwunye ọhụrụ na-eche ma na-egekwa ntị ịnụ olu ya, ọṅụ na-ejupụtakwa ya obi mgbe ọ nụrụ olu onye ahụ na-alụ nwunye ọhụrụ. Ya mere, ọṅụ m e zuola oke ugbu a.
30Ọ ghaghị ịdị elu, ma mụ onwe m aghaghị ịdịkwa ala.
31“Onye ahụ si nʼelu bịa dị elu karịa ihe niile, onye ahụ si nʼụwa bụkwa nke ụwa ma na-ekwukwa okwu dị ka onye si nʼụwa. Onye ahụ si nʼeluigwe dị elu karịa ihe niile.
32Ọ na-agba ama banyere ihe ọ hụrụ nakwa nke ọ nụrụ, ma o nweghị onye na-anabata ama ya.