32Ọ na-agba ama banyere ihe ọ hụrụ nakwa nke ọ nụrụ, ma o nweghị onye na-anabata ama ya.
33Onye ọbụla nabatara akaebe ya ji nke a mere akara, na Chineke bụ eziokwu.
34Nʼihi na onye Chineke zitere na-ekwu okwu Chineke. Nʼihi na ọ na-enye Mmụọ ya nʼuju.
35Nna hụrụ Ọkpara ya nʼanya, o tinyekwala ihe niile nʼaka ya.
36Onye ọbụla kwere nʼỌkpara ahụ nwere ndụ ebighị ebi, ma onye ọbụla jụrụ Ọkpara ahụ agaghị ahụ ndụ nʼihi na iwe Chineke ga-adịrị ya.”