4Nikọdimọs sịrị ya, “Olee otu a ga-esi mụgharịa mmadụ mgbe o mere okenye? Ọ ga-aba nʼafọ nne ya nke ugboro abụọ?”
5Ma Jisọs sịrị, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, ọ bụrụ na amụghị mmadụ site na mmiri na Mmụọ Nsọ, o nweghị ike ịba nʼalaeze Chineke.
6Ihe e si nʼanụ ahụ mụọ bụ anụ ahụ, ma ihe a mụrụ site na Mmụọ bụ mmụọ.
7Ya ejula gị anya na m sịrị gị, ‘Agaghị ịmụ unu ọzọ.’
8Ifufe na-efe nʼebe ọbụla masịrị ya. I nwere ike nụ ụzụ ya ma ịmataghị ebe o si abịa maọbụ ebe ọ na-aga. Otu a ka ọ dịkwara onye ọbụla a mụrụ site na Mmụọ.”