8(Ndị na-eso ụzọ ya abaala nʼime obodo ịga zụta nri.)
9Nwanyị ahụ sịrị ya, “Olee otu gị bụ onye Juu si arịọ m bụ nwanyị Sameria mmiri ka ị ṅụọ?” (Nʼihi na ndị Juu na ndị Sameria anaghị emekọrịta ihe ọbụla.)
10Jisọs zara sị, “Ọ bụrụ na ị matara onyinye Chineke, na onye ahụ na-arịọ gị mmiri, ị gaara arịọ ya, ọ gakwara enye gị mmiri nke ndụ.”
11Nwanyị ahụ sịrị ya, “Nna anyị ukwu, o nweghị ihe ọbụla i ji ị ga-eji dọrọ mmiri, olulu a dịkwa omimi. Oleekwanụ ebe ị ga-eweta mmiri ndụ a.
12Ọ bụ na ị ka nna nna anyị Jekọb ukwuu, onye gwuuru anyị olulu mmiri a? Ya onwe ya na ụmụ ya na igwe ehi na atụrụ ya ṅụkwara mmiri sitere na ya?”