13Jisọs zara sị, “Onye ọbụla ṅụrụ mmiri a, akpịrị ga-akpọ ya nkụ ọzọ.
14Ma onye ọbụla ga-aṅụ mmiri ahụ m nyere ya, akpịrị agaghị akpọkwa ya nkụ ọzọ. Nʼeziokwu, mmiri ahụ m nyere ya ga-aghọrọ ya isi iyi nke na-asọpụtara ya ndụ ebighị ebi.”
15Mgbe ahụ nwanyị ahụ sịrị ya, “Onyenwe anyị nye m mmiri a, ka akpịrị ghara ịkpọ m nkụ ọzọ, ka m gharakwa ịdị na-abịa ebe a ịdọrọ mmiri.”
16Ọ gwara ya sị, “Gaa kpọta di gị ma lọghachi.”
17Nwanyị ahụ zaghachiri ya sị, “Enweghị m dị.” Jisọs sịrị ya, “I kwuru eziokwu mgbe ị sịrị na i nweghị di.