28Mgbe ahụ, nwanyị ahụ hapụrụ ite mmiri ya laghachi nʼime obodo ga gwa ndị mmadụ,
29“Bịanụ lee otu nwoke onye gwara m ihe niile m merela. Ọ ga-abụ na ọ bụ ya bụ Kraịst ahụ?”
30Ha sitere nʼobodo ahụ gbapụtasịa soro ụzọ ahụ, ka ha gakwuru ya.
31Ma otu ọ dị, ndị na-eso ụzọ ya rịọrọ ya sị, “Onye ozizi rienụ nri.”
32Ma ọ sịrị ha, “Enwere m nri m na-eri nke unu na-amaghị maka ya.”