33Mgbe ahụ ndị na-eso ụzọ ya sịrịtara onwe ha, “Ọ ga-abụ na o nwere onye butere ya nri?”
34Jisọs sịrị ha, “Nri m bụ ime uche onye ahụ zitere m nakwa ịrụcha ọrụ ya.
35Unu na-asị, ‘ọ fọdụghị ọnwa anọ ka ịghọ mkpụrụ nʼubi ruo?’ Ma ana m agwa unu, megheenụ anya unu lee ubi ahụ, ha achaala maka ọghụghọ.
36Ọ bụladị ugbu a, onye na-aghọ mkpụrụ na-anata ụgwọ ọrụ, ọ na-achịkọta mkpụrụ ahụ maka ndụ ebighị ebi, ka onye ghara mkpụrụ na onye ghọrọ ya nwee ike ịṅụrịkọta ọṅụ.
37Ya mere okwu ahụ nke na-asị, ‘Otu onye na-agha mkpụrụ, onye ọzọ na-aghọkwa ya bụ eziokwu.’