10Ma ndị Juu gwara nwoke ahụ a gwọrọ ọrịa, “Taa bụ ụbọchị izuike, o megidere iwu na ị ga-ebu ute gị.”
11Ma ọ zaghachiri ha, “Nwoke ahụ mere ka ahụ dị m mma sịrị m, ‘Chilie ute gị laa.’ ”
12Ha jụrụ ya, “Onye bụ onye ahụ gwara gị ka ị chilie ya laa?”
13Ma nwoke ahụ a gwọrọ amataghị onye ọ bụ nʼihi na Jisọs zoro onwe ya banye nʼetiti igwe mmadụ.
14Emesịa, Jisọs hụrụ ya nʼime ụlọnsọ ukwu sị ya, “Lee, e mela ka ahụ dị gị mma, emehiekwala ọzọ ka nke dị njọ karịa nke a hapụ ịbịakwasị gị.”