15Nwoke a siri nʼebe ahụ pụọ gaa gwa ndị Juu na ọ bụ Jisọs gwọrọ ya.
16Ya mere, nʼihi na Jisọs na-eme ihe ndị a nʼụbọchị izuike, ndị Juu malitere isogbu ya.
17Jisọs sịrị ha, “Nna m na-arụ ọrụ mgbe niile ruo ugbu a, mụ onwe m kwa, ana m arụ ọrụ.”
18Nʼihi nke a, ndị Juu chọsịrị ike igbu ya. Ọ bụghị naanị na o mebiri ụbọchị izuike, kama ọ na-akpọkwa Chineke Nna ya, sitekwa otu a na-eme ka ya na Chineke hara.
19Jisọs zara ha sị, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, o nweghị ihe ọbụla Ọkpara pụrụ ime nʼonwe ya; naanị ihe o nwere ike ime bụ ihe ọ hụrụ Nna ya na-eme, nʼihi na ihe ọbụla Nna ahụ na-eme ka Ọkpara ya na-emekwa.