18Nʼihi nke a, ndị Juu chọsịrị ike igbu ya. Ọ bụghị naanị na o mebiri ụbọchị izuike, kama ọ na-akpọkwa Chineke Nna ya, sitekwa otu a na-eme ka ya na Chineke hara.
19Jisọs zara ha sị, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, o nweghị ihe ọbụla Ọkpara pụrụ ime nʼonwe ya; naanị ihe o nwere ike ime bụ ihe ọ hụrụ Nna ya na-eme, nʼihi na ihe ọbụla Nna ahụ na-eme ka Ọkpara ya na-emekwa.
20Nʼihi na Nna ahụ hụrụ Ọkpara ya nʼanya ma na-egosikwa ya ihe niile ọ na-eme. Nʼezie ọ ga-agbagwoju unu anya nʼihi na ọ ga-egosi ya ihe karịrị ndị a.
21Nʼihi na dị ka nna ahụ si akpọte ndị nwụrụ anwụ na-enyekwa ha ndụ, otu ahụ ka Ọkpara ya si enye onye ọbụla ọ masịrị ya ndụ.
22Nna anaghị ekpe onye ọbụla ikpe, kama o nyefere ikpe niile nʼaka Ọkpara.