22Nna anaghị ekpe onye ọbụla ikpe, kama o nyefere ikpe niile nʼaka Ọkpara.
23Ka mmadụ niile nye Ọkpara ahụ nsọpụrụ dị ka ha na-asọpụrụ Nna ahụ. Onye ọbụla nke na-adịghị asọpụrụ Ọkpara ahụ adịghị asọpụrụ Nna nke zitere ya.
24“Nʼezie, nʼezie agwa m unu, onye ọbụla na-anụ okwu m ma kwerekwa nʼonye zitere m nwere ndụ ebighị ebi, a gaghị amakwa ya ikpe, ọ gafeela site nʼọnwụ banye na ndụ.
25Nʼezie, nʼezie agwa m unu, oge na-abịa, ọ bịakwala ugbu a mgbe ndị nwụrụ anwụ ga-anụ olu Ọkpara Chineke, ndị ahụ nụrụ ya ga-adịkwa ndụ.
26Dị ka Nna ahụ nwere ndụ nʼime onwe ya, otu a ka o nyekwara Ọkpara ahụ ike inwe ndụ nʼime onwe ya.