36“Ma e nwere m ama dị ukwuu karịa nke Jọn, nʼihi na ọrụ ahụ ya bụ Nna nyere m ka m rụchapụ, bụkwa nke m na-arụ, na-agbara m ama na ọ bụ Nna ahụ zitere m.
37Ya bụ Nna ahụ zitere m na-agbakwa ama nʼonwe ya banyere m. Unu anụbeghị olu maọbụ hụ ụdịdị ya.
38Okwu ya anọkwaghị nʼime unu nʼihi na unu ekweghị nʼonye o zitere.
39Unu na-enyocha akwụkwọ nsọ nʼihi na unu chere na unu ga-esite na ha nwee ndụ ebighị ebi maọbụ ha na-agba ama banyere m.
40Ma unu jụrụ ịbịakwute m ka unu nwee ndụ.