Jọn 6

Ma ọ sịrị ha, “Unu atụla egwu. Ọ bụ m.”

John 6:20 (UKJV) But he says unto them, It is I; be not afraid.

18Ebili mmiri maliri elu nʼihi nʼoke ifufe bidoro na-efe.

19Ha akwọọla ụgbọ ihe dịka kilomita ise maọbụ isii, mgbe ha hụrụ Jisọs ka ọ na-aga ije nʼelu mmiri ahụ na-abịa nso nʼụgbọ mmiri ha. Oke egwu tụkwara ha.

20Ma ọ sịrị ha, “Unu atụla egwu. Ọ bụ m.”

21Mgbe ahụ, ha nabatara ya nʼime ụgbọ ahụ, ọ dịkwaghị anya ụgbọ ha bịaruru nʼelu ala ebe ha na-aga.

22Nʼechi ya, igwe mmadụ ahụ nọdụrụ nʼofe ọzọ nke ọnụ mmiri ahụ chọpụtara na ọ bụ naanị otu ụgbọ mmiri nta bịara nʼebe ahụ, na Jisọs esoghị ndị na-eso ụzọ ya banye nʼime ya, kama na ọ bụ naanị ndị na-eso ụzọ ya ka ụgbọ mmiri ahụ buuru pụọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.