53Jisọs sịrị ha, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, naanị ma unu riri anụ ahụ Nwa nke Mmadụ ma ṅụọkwa ọbara ya, unu agaghị enwe ndụ nʼime onwe unu.
54Onye ọbụla riri anụ ahụ m, ṅụọkwa ọbara m nwere ndụ ebighị ebi. A ga m akpọlitekwa ya nʼụbọchị ikpeazụ ahụ.
55Nʼihi na anụ ahụ m bụ ezigbo nri, ọbara m bụkwa ezigbo ihe ọṅụṅụ.
56Onye ọbụla na-eri anụ ahụ m na-aṅụkwa ọbara m na-anọgide nʼime m mụ onwe m kwa nʼime ya.
57Dị ka Nna ahụ dị ndụ zitere m, ana m adịkwa ndụ nʼihi Nna ahụ, otu a ka onye na-eri m ga-adịkwa ndụ site na m.