Jọn 6

Filip zara ya, “Ụgwọ ọrụ ọnwa isii agaghị ezu ịzụta achịcha nke onye ọbụla nʼime ha ga-atatụ naanị ihe ntakịrị.”

John 6:7 (UKJV) Philip answered him, Two hundred pennyworth of bread is not sufficient for them, that every one of them may take a little.

5Mgbe Jisọs leliri anya elu hụ oke igwe mmadụ na-abịakwute ya, ọ sịrị Filip, “Olee ebe anyị ga-azụta achịcha ndị a ga-ata?”

6Ọ jụrụ nke a naanị iji nwalee ya, ya onwe ya mararị ihe ọ ga-eme.

7Filip zara ya, “Ụgwọ ọrụ ọnwa isii agaghị ezu ịzụta achịcha nke onye ọbụla nʼime ha ga-atatụ naanị ihe ntakịrị.”

8Onye ọzọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya bụ Andru, nwanne Saimọn Pita, kwupụtara,

9“Otu nwantakịrị nwoke nọ nʼebe a nwere ogbe achịcha balị ise, na azụ abụọ, ma gịnị ka ha bụ nʼetiti igwe mmadụ ha otu a?”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.