12E nwere oke ntamu nʼetiti igwe mmadụ ahụ banyere ya. Ndị ụfọdụ na-asị, “Ọ bụ ezigbo mmadụ.” Ndị ọzọ na-asị, “Mba, ọ na-eduhie igwe mmadụ.”
13Ma o nweghị onye ọbụla kwulitere okwu maka ya nʼihu ọha nʼihi egwu ndị Juu.
14Mgbe o ruru nʼetiti mmemme ahụ, Jisọs banyere nʼime ụlọnsọ ukwu ma bido ikuzi ihe.
15Site nʼoke mgbagwoju anya, ndị Juu jụrịtara onwe ha sị, “Olee otu nwoke a sịrị nweta amamihe dị otu a ebe ọ bụ na o nwebeghị onye kuziri ya ihe ọbụla?”
16Jisọs zara ha, “Ozizi m abụghị nke m, kama ọ bụ nke onye ahụ zitere m.