Jọn 7

Igwe mmadụ ahụ zara, “Mmụọ ọjọọ bi nʼime gị, onye chọrọ igbu gị?”

John 7:20 (UKJV) The people answered and said, You have a devil: who goes about to kill you?

18Ndị ahụ na-ekwu nke onwe ha na-eme nke a iji wetara onwe ha ugwu, ma onye ahụ na-achọ ugwu nke onye zitere ya bụ onye eziokwu; o nwekwaghị ihe ọbụla bụ ụgha banyere ya.

19Mosis o nyeghị unu iwu? Ma o nweghị onye ọbụla nʼime unu na-edebe iwu ahụ. Gịnị mere unu ji achọ igbu m?”

20Igwe mmadụ ahụ zara, “Mmụọ ọjọọ bi nʼime gị, onye chọrọ igbu gị?”

21Jisọs zara sị ha, “Arụrụ m otu ọrụ, ma unu niile nọ na mgbagwoju anya.

22Mosis nyere unu iwu ibi ugwu (nʼagbanyeghị na o siteghị na Mosis, kama na nna nna anyị ha), nʼụbọchị izuike unu na-ebikwa mmadụ ugwu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.