27Ma anyị matara ebe nwoke a siri pụta, mgbe Kraịst ahụ ga-abịa, o nweghị onye ga-amata ebe o siri pụta.”
28Ma dị ka Jisọs na-ezi ihe nʼime ụlọnsọ ukwuu ahụ, o tiri mkpu sị, “Nʼezie, unu maara m, matakwa ebe m siri pụta. Anọghị m nʼebe a na nke onwe m, ma onye ahụ zitere m bụ eziokwu. Unu amaghị ya.
29Ma amara m ya, nʼihi na esitere m na ya bịa. Ọ bụkwa ya zitere m.”
30Mgbe ahụ ha chọrọ ijide ya, ma o nweghị onye ọbụla metụrụ ya aka nʼihi na oge ya erubeghị.
31Ma otu ọ dị, ọtụtụ nʼime igwe mmadụ ahụ kweere na ya. Ha sịrị, “Mgbe Kraịst ahụ ga-abịa, ọ ga-arụ ọrụ ebube ọzọ karịrị ndị a nwoke a rụrụla?”