7Ụwa enweghị ike ịkpọ unu asị, ma ọ kpọrọ m asị nʼihi na ana m agba ama megide ya nʼọrụ ya jọrọ njọ.
8Unu onwe unu gaanụ na mmemme ahụ, agaghị m aga mmemme a nʼihi na oge m erubeghị.”
9Mgbe o kwusiri nke a, ọ nọgidere na Galili.
10Ma otu ọ dị, mgbe ụmụnne ya gawara mmemme ahụ ya onwe ya gakwara. Ọ gaghị ebe mmadụ niile ga-ahụ ya kama ọ gara na nzuzo.
11Na mmemme ahụ ndị Juu nọ na-ele anya ma na-ajụgharị sị, “Olee ebe ọ nọ?”