Jọn 8

Jisọs gwara ha, “Ọ bụrụ nʼezie na Chineke bụ Nna unu, unu ga-ahụ m nʼanya, nʼihi na ọ bụ Chineke zitere m. Abịaghị m site nʼike aka m.

John 8:42 (UKJV) Jesus said unto them, If God were your Father, all of you would love me: for I proceeded forth and came from God; neither came I of myself, but he sent me.

40Ma unu na-achọ igbu m, bụ onye gwara unu eziokwu ahụ m nụrụ nʼebe Chineke nọ. Ebraham emeghị otu a.

41Unu na-arụ ọrụ nna unu rụrụ.” Ha sịrị ya, “Anyị abụghị ụmụ a mụrụ site nʼịkwa iko; naanị Chineke ya onwe ya bụ otu Nna anyị nwere.”

42Jisọs gwara ha, “Ọ bụrụ nʼezie na Chineke bụ Nna unu, unu ga-ahụ m nʼanya, nʼihi na ọ bụ Chineke zitere m. Abịaghị m site nʼike aka m.

43Gịnị mere unu adịghị aghọta ihe m na-ekwu? Ọ bụ na unu enweghị ike ịnabata okwu m.

44Unu bụ ụmụ nke nna unu ekwensu. Uche unu bụ imezu ihe nke nna unu na-achọ. Ọ bụ ogbu ọchụ site na mbụ. Ọ dịghị ejigide eziokwu nʼihi na eziokwu adịghị nʼime ya. Mgbe ọ na-ekwu okwu ụgha, ọ na-ekwu dị ka ọdịdị ya sịrị dị, nʼihi na ọ bụ onye ụgha bụrụkwa nna nke ụgha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.