20Ndị mụrụ ya zara, “nke a bụ nwa anyị. Anyị matakwara na o kpuru ìsì site nʼoge anyị mụrụ ya.
21Ma otu o si ahụ ụzọ ugbu a maọbụ onye meghere anya ya, anyị amaghị. Jụọnụ ya. Ọ bụ dimkpa, ya zara ọnụ ya.”
22Ihe a ka ndị mụrụ ya kwuru nʼihi na ha na-atụ egwu ndị Juu. Ndị kpebirila na ọ bụrụ na onye ọbụla ekwuo na Jisọs bụ Kraịst ahụ, ha ga-achụpụ onye ahụ site nʼụlọ ekpere ha.
23Nke a mere ndị mụrụ ya jiri sị, “Ọ bụ dimkpa, unu jụọ ya.”
24Ha kpọrọ nwoke a nke ugboro abụọ, bụ onye ahụ kpuburu ìsì, sị ya, “Nye Chineke otuto. Anyị maara na nwoke a bụ onye mmehie.”