1Mgbe ọ na-agafe, ọ hụrụ otu nwoke kpuru ìsì site nʼafọ nne ya.
2Ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya sị, “Onye ozizi, onye mehiere? Nwoke a ka ọ bụ ndị mụrụ ya, nke mere e ji mụọ ya nʼìsí?”
3Jisọs sịrị, “Nwoke a emehieghị, ndị mụrụ ya emehiekwaghị, kama o kpuru ìsì ka ọrụ Chineke pụta ìhè na ndụ ya.
4Anyị aghaghị ịrụ ọrụ onye ahụ zitere m, mgbe chi ka dị, anyasị na-abịa mgbe o nweghị onye pụrụ ịrụ ọrụ.
5Dị ka m nọ nʼụwa, Abụ m ìhè nke ụwa.”