5Dị ka m nọ nʼụwa, Abụ m ìhè nke ụwa.”
6Mgbe o kwusiri nke a, ọ bụsara ọnụ mmiri asụ nʼala gwakọta ya na aja, werekwa aja ahụ tee nwoke ahụ nʼanya.
7Ọ gwara ya, “Gaa nʼọdọ mmiri Sailọm saa ihu gị” (nke a pụtara “Zitere”). Ọ gara saa ihu ya, lọghachita na-ahụ ụzọ.
8Ndị agbataobi ya na ndị nʼahụ ya nʼoge gara aga ka ọ na-arịọ arịrịọ sịrị, “Nke a, ọ bụghị nwoke ahụ na-anọdụ ala na-arịọ arịrịọ?”
9Ụfọdụ na-asị, “Ọ bụ ya.” Ma ndị ọzọ na-asịkwa, “Ọ bụghị ya. Ọ bụ onye yiri ya.” Ma ọ na-asị, “Abụ m nwoke ahụ.”