13Kama, ndị ikom ahụ ji ike nyasie ụgbọ ahụ ichigharị ya laghachi nʼelu ala, ma ha enweghị ike. Nʼihi na oke osimiri ahụ na-amali elu karịa ka ọ dị na mbụ.
14Mgbe ahụ, ha tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa sị, “Onyenwe anyị, biko ekwela ka anyị nwụọ nʼihi ọnwụ nwoke a. Biko, atụkwasịkwala ọbara nwoke a na-emeghị ihe ọjọọ nʼisi anyị, nʼihi na gị Onyenwe anyị emeela dịka i si chọọ.”
15Ya mere, ha buliri Jona elu tụnye ya nʼime osimiri ahụ, ebili mmiri ahụ dajụkwara.
16Mgbe nke a mere ndị ikom ahụ tụrụ egwu Onyenwe anyị nke ukwuu. Ha chụụrụ Onyenwe anyị aja, kwekwa ya nkwa dị iche iche.
17Ma Onyenwe anyị akwadolarị otu azụ buru ibu ka o loo Jona. Ya mere, Jona nọrọ nʼafọ azụ ahụ ụbọchị atọ, ehihie na abalị.