Jona 4

Nʼihi ya, o kpeere Onyenwe anyị ekpere sị, “O, Onyenwe anyị, nke a ọ bụghị ihe m kwuru, mgbe m nọ nʼala m? Ọ bụ ya mere m ji chọọ ịgbalaga na Tashish na mbụ nʼihi na amaara m na ị bụ Chineke onye na-eme amara, na onye jupụtara nʼobi ebere, na onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ, nke bara ụba nʼịhụnanya, onye na-anaghị ata mmadụ ahụhụ dịka mmehie ya siri dị.

Jonah 4:2 (UKJV) And he prayed unto the LORD, and said, I pray you, O LORD, was not this my saying, when I was yet in my country? Therefore I fled before unto Tarshish: for I knew that you are a gracious God, and merciful, slow to anger, and of great kindness, and repent you of the evil.

1Ma ihe a jọrọ Jona njọ nʼobi nke ukwuu, iwe ya dịkwa ọkụ.

2Nʼihi ya, o kpeere Onyenwe anyị ekpere sị, “O, Onyenwe anyị, nke a ọ bụghị ihe m kwuru, mgbe m nọ nʼala m? Ọ bụ ya mere m ji chọọ ịgbalaga na Tashish na mbụ nʼihi na amaara m na ị bụ Chineke onye na-eme amara, na onye jupụtara nʼobi ebere, na onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ, nke bara ụba nʼịhụnanya, onye na-anaghị ata mmadụ ahụhụ dịka mmehie ya siri dị.

3Ugbu a, O, Onyenwe anyị napụ m ndụ m. Ọ ga-adị m mma ịnwụ anwụ karịa ịdị ndụ.”

4Ma Onyenwe anyị sịrị, “O ziri ezi na ị ga-esi otu a wee oke iwe dị ọkụ?”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.