Jona 4

Ma Chineke sịrị Jona, “Ọ bụ ihe ziri ezi ka i wee iwe maka osisi a?” Ọ sịrị, “E, ana m ewe oke iwe, ọ bụladị na m chọrọ ịnwụ.”

Jonah 4:9 (UKJV) And God said to Jonah, Do you well to be angry for the gourd? And he said, I do well to be angry, even unto death.

7Ma nʼisi ụtụtụ echi ya, Chineke mere ka otu ikpuru pụta nke riri osisi ahụ site nʼogwe ya, si otu a mee ka ọ kpọnwụọ.

8O ruo, mgbe anyanwụ wara, Chineke mere ka ifufe na-ekpo ọkụ site nʼọwụwa anyanwụ, anyanwụ a chara Jona nʼisi nke ukwuu nke mere nʼike gwụsịrị ya. Ọ rịọrọ ka ọnwụ gbuo ya, na-asị, “ọ ga a kaara m mma na m nwụrụ anwụ, karịa na m dị ndụ.”

9Ma Chineke sịrị Jona, “Ọ bụ ihe ziri ezi ka i wee iwe maka osisi a?” Ọ sịrị, “E, ana m ewe oke iwe, ọ bụladị na m chọrọ ịnwụ.”

10Mgbe ahụ Onyenwe anyị kwuru, “I nwere obi ebere nʼebe osisi a dị, nke ị na-akụghị na nke i mekwaghị ka o too, bụ nke toro nʼanyasị, nwụọkwa nʼanyasị.

11Mụ onwe m, m ga-aghara inwe obi ebere nʼahụ obodo ukwu a dịka Ninive, nke nwere ihe karịrị narị puku ndị mmadụ na iri puku mmadụ abụọ, bụ ndị na-amaghị nke bụ aka nri ha maọbụ aka ekpe ha, na nke ọtụtụ anụmanụ dịkwa nʼime ya?”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.