11“Jegharịanụ nʼetiti ebe obibi ụmụ Izrel gwa mmadụ niile okwu sị ha ‘Dozierenụ onwe unu ihe unu ga-eri nʼụzọ, nʼihi na nʼime ụbọchị atọ, anyị ga-agafe osimiri Jọdan, imeri na inweta ala ahụ Onyenwe anyị bụ Chineke na-enye unu.’ ”
12Joshua kpọkọtara ndịisi ebo Ruben, na Gad, na ọkara ebo Manase, gwa ha okwu sị,
13“Chetanụ iwu ahụ Mosis odibo Onyenwe anyị nyere unu, mgbe ọ sịrị, ‘Onyenwe anyị Chineke unu na-enye unu izuike. O nyekwala unu ala a.’
14Kama ndị nwunye unu, na ụmụntakịrị unu, na anụ ụlọ unu, ga-anọ nʼala a dị nʼọwụwa anyanwụ nke Mosis nyere unu. Ma ndị agha unu, ndị jikeere ejike, ga-eduru ndị Izrel ndị ọzọ gafee osimiri Jọdan inyere ụmụnna ha aka,
15tutu ruo mgbe Onyenwe anyị Chineke unu nyere ha izuike, dịka o si nye unu, na tutu ruo mgbe ha nwetara ala niile bụ nke Onyenwe anyị Chineke unu ga-enye ha. Mgbe nke a mezuru, unu ga-alaghachi azụ, nweta ala ahụ Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere unu nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan.”