Joshua 1

Mgbe ahụ, ha zara Joshua, “Ihe ọbụla nke ị nyere anyị nʼiwu anyị ga-eme ha, ebe ọbụla i zigara anyị ka anyị ga-aga.

Joshua 1:16 (UKJV) And they answered Joshua, saying, All that you command us we will do, and anywhere you send us, we will go.

14Kama ndị nwunye unu, na ụmụntakịrị unu, na anụ ụlọ unu, ga-anọ nʼala a dị nʼọwụwa anyanwụ nke Mosis nyere unu. Ma ndị agha unu, ndị jikeere ejike, ga-eduru ndị Izrel ndị ọzọ gafee osimiri Jọdan inyere ụmụnna ha aka,

15tutu ruo mgbe Onyenwe anyị Chineke unu nyere ha izuike, dịka o si nye unu, na tutu ruo mgbe ha nwetara ala niile bụ nke Onyenwe anyị Chineke unu ga-enye ha. Mgbe nke a mezuru, unu ga-alaghachi azụ, nweta ala ahụ Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere unu nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan.”

16Mgbe ahụ, ha zara Joshua, “Ihe ọbụla nke ị nyere anyị nʼiwu anyị ga-eme ha, ebe ọbụla i zigara anyị ka anyị ga-aga.

17Anyị ga-ege gị ntị dịka anyị si gee Mosis ntị. Ka Onyenwe anyị Chineke gị nọnyere gị dịka o si nọnyere Mosis.

18Onye ọbụla nupuru isi nʼiwu i nyere anyị, ọ ga-anwụ. Naanị dịrị ike, nweekwa obi ike.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.