Joshua 1

Dịrị ike, nweekwa ume, nʼihi na ị ga-abụ onye ga-edu ndị a iketa ala ahụ m ṅụrụ nʼiyi inye nna nna ha ochie.

Joshua 1:6 (UKJV) Be strong and of a good courage: for unto this people shall you divide for an inheritance the land, which I swore unto their fathers to give them.

4Oke ala unu ga-abụ site nʼọzara dị na ndịda ruo Lebanọn, ma site nʼiyi ukwu Yufretis, tinyere ala niile nke ndị Het, ruo nʼosimiri ukwu ahụ dị nʼọdịda anyanwụ.

5Ọ dịghị onye ọbụla pụrụ iguzo imegide gị ụbọchị niile nke ndụ gị. Aga m anọnyere gị dịka m si nọnyere Mosis. Agaghị m ahapụ gị aka. Agaghị m agbakụtakwa gị azụ.

6Dịrị ike, nweekwa ume, nʼihi na ị ga-abụ onye ga-edu ndị a iketa ala ahụ m ṅụrụ nʼiyi inye nna nna ha ochie.

7“Naanị dịrị ike, nweekwa ume. Lezie anya ime ihe niile Mosis bụ odibo m nyere gị nʼiwu. Ewezugala onwe gị na ya gaa aka nri maọbụ aka ekpe, ka ihe si otu a gaara gị nke ọma nʼebe ọbụla ị na-aga.

8Esitela nʼọnụ gị wezuga ihe dị nʼAkwụkwọ Iwu a. Kama na-atụgharị uche gị na ya ehihie na abalị, ka i si otu a lezie anya imezu ihe niile e dere nʼime ya. Mgbe ahụ ị ga-aba ụba, ihe ga-agakwara gị nke ọma.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.