Joshua 10

Ya mere, ha kpọpụtara ndị eze ise ahụ site nʼọgba nkume ahụ, ha bụ eze Jerusalem, na eze Hebrọn, na eze Jamut, na eze Lakish, na eze Eglọn.

Joshua 10:23 (UKJV) And they did so, and brought forth those five kings unto him out of the cave, the king of Jerusalem, the king of Hebron, the king of Jarmuth, the king of Lachish, and the king of Eglon.

21Ndị agha niile laghachikwuru Joshua nʼọmụma ụlọ ikwu ha dị na Makeda nʼudo. Ọ dịkwaghị onye ọbụla nwara anwa kwuo okwu megide ndị Izrel nʼala ahụ.

22Mgbe ahụ Joshua sịrị, “Megheenụ ọnụ ọgba nkume ahụ, wepụtanụ ndị eze ise ahụ.”

23Ya mere, ha kpọpụtara ndị eze ise ahụ site nʼọgba nkume ahụ, ha bụ eze Jerusalem, na eze Hebrọn, na eze Jamut, na eze Lakish, na eze Eglọn.

24Mgbe a kpụtara ha nʼihu Joshua, ọ kpọrọ ndị ikom Izrel niile ka ha zụkọta, ọ gwara ndịisi agha bụ ndị so ya jee, “Bịanụ nso, zọkwasịnụ ụkwụ unu nʼolu eze ndị a.” Ya mere, ha bịara zọkwasị ụkwụ ha nʼolu ha.

25Joshua sịrị ha, “Unu atụla egwu, maọbụ daa mba. Dịnụ ike, nweekwanụ ume, nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị ga-eme ndị iro unu niile bụ ndị na-ebuso unu agha.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.