Joshua 10

Site na Libna, Joshua na ndị Izrel gara ruo Lakish, lụso ha agha.

Joshua 10:31 (UKJV) And Joshua passed from Libnah, and all Israel with him, unto Lachish, and encamped against it, and fought against it:

29Joshua na ndị Izrel niile so ya sitere na Makeda gaa na Libna lụso ya agha.

30Onyenwe anyị nyekwara obodo a na eze ya nʼaka Izrel. Joshua weere mma agha ya tigbuo mmadụ niile dị nʼime ya. O nweghị onye ọbụla nke ọ hapụrụ ndụ nʼebe ahụ. O mekwara eze obodo a ihe o mere eze Jeriko.

31Site na Libna, Joshua na ndị Izrel gara ruo Lakish, lụso ha agha.

32Ma Onyenwe anyị nyefere Lakish nʼaka ụmụ Izrel. Joshua lụgburu ya nʼụbọchị nke abụọ ya. Ha weere mma agha ha tigbuo mmadụ niile bi nʼime ya, dịka ha mere Libna.

33Ma mgbe a na-alụ agha na Lakish, Horam eze Gaza, duuru ndị agha ya bịa inyere ndị obodo Lakish aka, ka ha si otu a gbochie ndị agha Izrel ịbata nʼime ya. Ma ndị agha Joshua gburu ya, laa ndị agha ya niile nʼiyi, ruo na ọ fọdụghị otu onye.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.